NA bu otu n’ime mkpụrụ okwu di ezigbo mkpa n’asụsụ Igbo. Ọ na-arụ nnukwu ọrụ n’ụtọ asụsụ Igbo. Ọ di ụzọ di iche a na-ede ya n’ahiriokwu. Ọrụ na na-arụ n’ahiriokwu gosiri etu a na-ede ya n’ime ahiriokwu.
1. NA na-aru ọrụ dika isingwa (main verb). Mgbe ọ bụla na na-aru ọru dika isingwa, ọ na-aghọrọ ngwa.
2. NA na-aru ọrụ nnyemaaka ngwaa (auxiliary verb). Mgbe na na-aru ọrụ dika nnyemaaka ngwaa, a na-edoka ya na ngwaa ọ na-enyere aka aka site itinye akara edemede nke a na-akpọ hyphen.
3. NA na-arụ ọrụ njiko mkpọaha (conjuction). Mgbe na na-arụ ọrụ dika njiko mkpọaha, a na-ede ya ka ọ kwuru onwe ya.
4. NA na-arụ ọrụ mbuụzọ (Preposition). Mgbe na nọ n’ihu okwu e jiri udaume bido, a na-ewepu a tinye rikom elu.
4b. Mgbe na nọ n’ihu okwu bidoro na mgbochiume ọ na-anọrọ onwe ya.