KA dika NA na-arụ ọrụ di iche iche n’asụsụ Igbo. Ọ na-arụ ọrụ di ka ngwaa, nnyemaaka ngwaa, n-yiri onwe, ebu m n’uche, nsonaazu, njiko mkpọaha, njiko nkebiokwu na njiko ahiriokwu
1. KA na-arụ ọrụ dika ngwaa.
a. Ihe ndi a kariri uche mmadu nghta – This is more than human understanding.
b. Ọ kacha di mfe – It’s easier.
c. Ọ kagburu ugwọ ya – S/he cancelled his or her debt.
2. KA na-arụ ọrụ dika nnyemaaka. Mgbe ọ na-arụ orụ di ka nnyemaaka ngwaa, a na-eji akara hyphen edoka ya na ngwaa ọ na-enyere aka ọnụ. Mgbe KA na-arụ ọrụ di ka nnyemaaka ngwaa, ọ na-egosi kara ime (conditional tenses)
a. Ọ ka-abia ma a si na ọ hughi ọgbatutu – S/he could have come, but s/he could not see a bike.
b. I ka-ekwu eziokwu – You would have said the truth.
3. Ya na ‘GA’ na-arụkọ ọrụ ọnụ di ka nnyemaaka ngwaa. Ọ na-akwụrụ onwe ya ebe e ji hyphen edekọ ga na ngwaa ọnụ. N’oge di otu a, ọ na-egosi ahiriokwu na-ekwu maka ihe ka ga-ime (future tenses).
a. Ha ka ga-abia – They will still come.
b. Ha ka ga-ekwu eziokwu – They will still say the truth.
c. Anyi ka ga-akpọ gi – We will still call you.
4. YA na NA na-arụkọ ọrụ ọnụ di ka nnyemaaka ngwaa. N’oge di otu a, ọ na-egosi ahiriokwu na-ekwu maka ihe ka na-eme eme n’oge gara aga. (Past continous tenses).
a. Ọ ka na-arahu ụra mgbe m tetara – S/he was still sleeping when I woke up.
b. Ha ka na-ebido ebido mgbe anyi batara- They were beginning when we arrived.
c. Anyi ka na-ekwu nke ha mere, ha e mekwa ọzọ – We are still discussing what they did, and they are doing more.
Ref: S. O Ezeomeke, Igodo Nghọta Ụtọasụsụ Igbo, 1999