Dayọsisi nke nzuko Katọlik di na Be-Komo (Baie-Comeau) mere emume mbido afọ ohụrụ n’ụbọchi 11 na 12 nke ọnwa asatọ nke afọ 2019. Dayọsisi nke Be-Komo di na akụkụ ugwu nke mpaghara obodo nke Kebek, Kanada. Ọ bu obere dayọsisi nwere nnụkwụ ala. Site na mbido ruo na ngwụcha ya, dayọsisi Be-Komo kariri mkpokọta ala ọwụwa anyanyu Naijiria nile ụzọ asatọ. Ọ kariri ala Enugu, Anambra, Imo, Abia, na Ebonyi ụzọ asatọ.
N’oge ụfọdụ, onye chọrọ I ga na parishi di iche iche na Dayọsisi a ga eweputariri ihe kariri izụ uka abuọ. Ọ ga ejinwu ụgbọala ga ebe ụfọdụ mana n’ọtụtụ ebe ejighi ụgbọ ala aga ha. Ọ bu nani ugbọ elu, ugbọ mmiri, ọgba tum-tum nke akpa mmiri igwe ma ọ bu ụgbọ oloko ka e ji aga ha.
Na mmeme mbido afọ nke afọ a, ihe anyi jiri mere isi okwu bu “Ka anyi jiri aṅuri nke ozioma soro umuokorobia na ụmụagbọghọbia na-etolita etolita banye n’ọrụ nke alaeze”. Site na mbido, anyi ledoro anya na ihe mere na ndi na-etolita etolita anaghizi achọ ibia ọgbakọ na mmeme di iche iche nke ụka na-atinye. Ụzọ ihe olemole pụtara ihe. Nke mbu, ha anaghi aghọtacha ihe anyi na-eme. Nke abuọ bu na mmeme ụfọdu anyi na-eme anaghi atọ ha ụtọ. Nke atọ a bụrụ na ha nwere ihe ndi ọzọ di iche uche ha di na ya, wdz.
Mgbe anyi chọputachara ihe ndi a, anyi biara choba ụzọ anyi ga-esi mee ka mmeme na ọgbakọ anyi ghara ibu nani nke ndi okenye. Na ihe di iche iche anyi ledoro anya, nke kachasi puta ihe bu I ge ndi na etolita etolita nti ka anyi mara n’eziokwu ihe ha chọrọ. Nke ọzọ a buru ichọ ụzọ asụsụ anyi ga-esi bụrụ ihe ha ga-aghọta ya na etu mmeme anyi ga-aburu nke ha. N’ime ihe ndi a nile, anyi gbara mbọ ihu na anyi agaghi agbaa ozioma anyi na-agbasa mmiri.
Na ngwucha, parishi ọ bụla kwuru ihe ha ga-eme iji wee ruo ndi na-etolita etolita nso. Ndi ụfọdụ siri na ha ga-atinye mmeme di iche na-atọ ha ụtọ, ebe ndi ọzọ kwere nkwa itinye nkuzi na ọgbakọ maka ha. Mmadu nile jiri nnukwu aṅuri na ọchi laghachi na parishi di iche ha siri bia.
Abstract : Baie-Comeau Diocese started its new pastoral year discussing about the youth ministry. During the two days work, entitled “With the youths, let us pass to action in the joy of the Gospel”, the attendees discussed issues related to the absence of the youths in the Church activities. It was noticed that among other things, the youths often feel disconnected from our realities. They also often feel unattracted to our liturgy and sometimes are being drawn to other events. It was agreed that each parish should double their efforts to develop activities more adapted to the realities of the youth and our time.