
Ga bu otu mkpuruokwu di nnukwu mkpa n’usoro edemede asụsụ Igbo. Ọ na-arụ ọrụ di iche n’asụsụ Igbo. Ọ na-arụ ọru di ka ngwaa, nnyemaaka na mgbochi, 1. GA na-arụ ọrụ dika ngwaa. Mgbe ga na-arụ ọrụ dika ngwaa, ga na-akwuru onwe ya. a. Ọ gaa ụlo akwụkwọ — S/he goes to school. b. Ha gawara ebe ahu – They went there. ...